FIL
FIL Filipino
M'Cheyne Bible Journey
Plano sa Pagbasa ng Bibliya — M'Cheyne Isang Taon
Sundin itong Bible Reading Plan sa apat na sipi sa isang araw—ang Lumang Tipan minsan at ang Bagong Tipan at Mga Awit dalawang beses sa isang taon.
KO Koreano
EN Ingles
CN Intsik
JP Hapon
PH mga wika sa Pilipinas
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persiyano
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indones
PT Portuges
VI Biyetnames
AR Arabe
RU Ruso
UK Ukrainiano
RO Rumano
IT Italyano
FI Pinlandes
TO Tongan
HR Kroatyano
SR Serbiano
TR Turko
HU Unggaro
PL Polako
SK Eslobako
LA Latin
NL Olandes
CS Tseko
FR Pranses
ES Espanyol
DE Aleman
OT Iba pang mga wika
Pagkumpirma ng pagbabasa
Natapos mo ba itong M'Cheyne day?
Kumpirmahin ito upang markahan ang araw na ito na kumpleto sa iyong tsart ng pag-unlad ng M'Cheyne.
레위기 2, 3
Laws for the Grain Offering
1“ ‘Mgbe onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya,
2ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
3Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
Baked and Cooked Grain Offerings
4“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
5Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya.
6Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka.
7Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv.
8Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja.
9Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ Onyenwe anyị ezi ụtọ.
10Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
Regulations on Yeast and Salt
11“ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
12Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ.
13Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
Grain Offering of Firstfruits
14“ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
15Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
16Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Fellowship Offering from the Herd
1“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.
2Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
3Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha,
4akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
5Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
Fellowship Offering from the Flock
6“ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.
7Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.
8Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
9Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,
10na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
11Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Fellowship Offering of a Goat
12“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
13ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
14Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha,
15na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
16Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.
17“ ‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’ ”
요한복음 21
Jesus Appears at the Sea of Tiberias
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee.
2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.
4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs.
5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?”
6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ.
8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.
9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.”
11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.
12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị.
13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ.
14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
Jesus Restores Peter
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?”
16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”
20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”)
21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?”
22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.”
23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”
24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu.
25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
잠언 18
The Power of Words and the Wisdom of Friendship
1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,
2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,
13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị
14Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,
15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,
16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,
17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,
18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ
19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.
20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.
21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.
22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;
24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,
골로새서 1
Greeting
1Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,
2Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi.
Thanksgiving and Prayer for the Colossians
3Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.
4Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya.
5Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma,
6nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.
7Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu.
8O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ.
Prayer for Wisdom to Walk Worthily
9Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile.
10Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile.
11Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
12na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè.
13Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya.
14Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.
The Supremacy of Christ
15Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke.
16Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya.
17Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile.
19Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi.
20Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.
Reconciled Through the Cross
21Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu.
22Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha.
23Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
Paul's Labor and Ministry for the Church
24Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị.
25Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya.
26Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke.
27Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ.
28Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst.
29Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.