맥체인 성경 여정

성경읽기표 — 맥체인 1년 통독

성경읽기표를 따라 하루 4본문을 읽으며 1년에 구약 1회, 신약과 시편을 2회 통독합니다.

365 1년 고정 통독표
4 하루 4본문
269 선택한 일차
‹ 269일차 / 총 365일 ›
역본

통독 확인

이 일차의 맥체인 본문을 완료했나요?

확인 버튼을 누르면 마이페이지 맥체인 진도표에 완료로 기록됩니다.

가정 예배 · 구약

사무엘하 22

본문 열기 →
22장

David's Song of Thanksgiving

1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.

2Ọ sịrị:

3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.

4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.

5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;

6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,

7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,

8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,

9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;

10O kewara mbara eluigwe, rịdata;

11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,

12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,

13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,

14Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.

15Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.

16E kpughere ala ala nke oke osimiri.

17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya,

18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,

19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.

20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,

21“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,

22Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;

23Iwu ya niile dị nʼihu m,

24Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,

25Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,

26“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,

27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,

28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,

29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,

30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;

31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;

32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?

33Ọ bụ Chineke na-enye m ike,

34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele

35Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,

36Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

37Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.

38“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.

39Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.

40Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.

41I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.

42Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.

43Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.

44“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.

45Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,

46Obi na-ada ha mba.

47“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.

48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.

49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.

50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.

51“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.

가정 예배 · 신약

갈라디아서 2

본문 열기 →
2장

The Gospel to the Gentiles Affirmed by the Apostles

1Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee.

2Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.

3Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.

4Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.

5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.

6Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.

7Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.

8Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.

9Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.

10Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.

Paul Rebukes Peter at Antioch

11Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.

12Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.

13Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya.

14Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”

Justified by Faith

15Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie,

16ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.

17Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!

18Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.

19Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.

20Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

21Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.

개인 경건 · 구약/시편

에스겔 29

본문 열기 →
29장

Judgment on Pharaoh of Egypt Like a Great Monster

1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.

3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

4Ma aga m etinye nko nʼagba gị,

5Aga m ahapụ gị

6Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

7Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.

8“ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.

9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

10Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.

11Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.

12Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.

13“ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.

14Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.

15Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.

16Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ ”

The Land of Egypt Given to Nebuchadnezzar

17Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

18“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.

19Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.

20Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”

21“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

개인 경건 · 신약

시편 78:1-37

본문 열기 →
78장

God's Deeds Handed Down to the Generations

1Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;

2Aga m eji ilu malite okwu m,

3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,

4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,

5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,

6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,

7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,

8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha,

9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha,

10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke.

11Ha chefuru ihe o mere,

12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha

13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha.

14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie,

15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara,

16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta,

17Ha nọgidere na-emehie megide ya.

18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa,

19Ha kwuhiere Chineke;

20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe,

21Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya;

22Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke,

23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu

24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.

25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.

26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ,

27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu,

28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha

29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ,

30Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ,

31mgbe iwe Chineke biliri imegide ha;

32Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha,

33O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu.

34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya;

35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha,

36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe,

37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.