맥체인 성경 여정

성경읽기표 — 맥체인 1년 통독

성경읽기표를 따라 하루 4본문을 읽으며 1년에 구약 1회, 신약과 시편을 2회 통독합니다.

365 1년 고정 통독표
4 하루 4본문
270 선택한 일차
‹ 270일차 / 총 365일 오늘 ›
역본

통독 확인

이 일차의 맥체인 본문을 완료했나요?

확인 버튼을 누르면 마이페이지 맥체인 진도표에 완료로 기록됩니다.

가정 예배 · 구약

사무엘하 23

본문 열기 →
23장

The Last Words of David

1Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:

2“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m,

3Chineke Izrel kwuru okwu,

4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta

5“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ.

6Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu,

7Onye ọbụla metụrụ ogwu aka,

David's Mighty Men

8Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere:

9Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,

10ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.

11Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.

12Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.

13Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.

14Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem.

15Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”

16Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.

17Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya.

18Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.

19Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.

20Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.

21O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya

22Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ.

23A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.

24Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ:

25Shama, onye Harod,

26Helez onye Palti,

27Abieza, onye Anatot,

28Zalmon, onye Ahohi,

29Heled, nwa Baana, onye Netofa,

30Benaya, onye Piraton,

31Abi-Albon, onye Arba,

32Eliaba, onye Shaalbon,

33nwa Shama, onye Hara

34Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka,

35Hezro, onye Kamel,

36Igal nwa Netan, onye Zoba,

37Zelek, onye Amọn,

38Ira, onye Itra,

39na Ụraya, onye Het.

가정 예배 · 신약

갈라디아서 3

본문 열기 →
3장

The Spirit Received Not by the Law

1Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst.

2Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?

3Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ?

4Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu?

5Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?

Abraham's Faith and the Curse of the Law

6Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.

7Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham.

8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”

9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.

10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.”

11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”

12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”

13Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.”

14Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.

The Promise Precedes the Law

15Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a.

16Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.

17Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga.

18Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.

19Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire.

20Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu.

21Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.

22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.

Children of God Through Faith

23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè.

24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe.

25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.

26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.

27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.

28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.

29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.

개인 경건 · 구약/시편

에스겔 30

본문 열기 →
30장

The Day of the Lord Coming Upon Egypt

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,

4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,

5Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,

8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.

10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,

12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.

13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.

15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,

16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,

17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti

18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis

19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,

The Prophecy of Pharaoh's Broken Arm

20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.

22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.

23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,

24meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.

25Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.

26Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

개인 경건 · 신약

시편 78:38-72

본문 열기 →
78장

38Ma o meere ha ebere.

39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,

40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara;

41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke;

42Ha echetaghị ike ya,

43nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt,

44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara.

45O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha,

46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha,

47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha,

48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri,

49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha,

50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso;

51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt,

52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ;

53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha,

54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya,

55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,

56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,

57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,

58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya;

59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu.

60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ,

61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha,

62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha;

63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha,

64E gburu ndị nchụaja ha nʼagha;

65Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta,

66Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ,

67Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef,

68ma ọ họọrọ ebo Juda,

69O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu,

70Ọ họpụtara Devid, ohu ya,

71o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya,

72Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha,