繁
KO 韓語
EN 英語
CN 中文
JP 日語
PH 菲律賓語系
HI 印地語
BN 孟加拉語
TA 坦米爾語
TE 泰盧固語
ML 馬拉雅拉姆語
FA 波斯語
MY 緬甸語
NE 尼泊爾語
MR 馬拉地語
KN 坎那達語
HA 豪薩語
YO 約魯巴語
SW 斯瓦希里語
IG 伊博語
ID 印尼語
PT 葡萄牙語
VI 越南語
AR 阿拉伯語
RU 俄語
UK 烏克蘭語
RO 羅馬尼亞語
IT 義大利語
FI 芬蘭語
TO 東加語
HR 克羅埃西亞語
SR 塞爾維亞語
TR 土耳其語
HU 匈牙利語
PL 波蘭語
SK 斯洛伐克語
LA 拉丁語
NL 荷蘭語
CS 捷克語
FR 法語
ES 西班牙語
DE 德語
OT 其他語言
讀經確認
你完成了這一天的麥琴讀經嗎?
點選確認後,會在我的頁面麥琴進度表中記錄為已完成。
열왕기상 2
David's Last Charge to Solomon
1Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
2“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke.
3Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị.
4Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’
5“Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ.
6Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo.
7“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm.
8“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’
9Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.”
10Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
11Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
12Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
Adonijah Seeks Abishag and Is Put to Death
13Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?”
14O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.”
15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.
16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.”
17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.”
21Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
22Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
24Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”
25Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.
Abiathar Banished and Joab Executed
26Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot. I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.”
27Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.
28Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.
29Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”
30Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ”
31Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri.
32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.
33Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.”
34Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara.
35Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata.
The End of Shimei Who Broke His Oath
36Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla.
37Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”
38Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
39Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat. Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.”
40Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
41Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ,
42eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’
43Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”
44Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị.
45Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
46Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ.
갈라디아서 6
Bear One Another's Burdens and Do Good
1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
3Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
4Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
5Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
6Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
7Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
8Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.
9Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
10Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
Boasting Only in the Cross of Christ
11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
13Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.
14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.
16Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke.
17Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m.
18Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
에스겔 33
The Duty and Calling of the Watchman
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche,
3onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,
4ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi.
5Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
6Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’
7“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
8Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
9Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
The Justice That Judges Each According to His Ways
10“Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’
11Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
12“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
13Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.
14Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
15ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
16Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.
17“Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
18Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.
19Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.
20Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
News of Jerusalem's Fall and the People's Hypocrisy
21O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”
22Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
23Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
24“Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’
25Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?
26Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’
27“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
28Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.
29Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
30“Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’
31Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
32Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.
33“Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”
시편 81, 82
A Voice Urging Obedience at the Feast
1Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ,
2Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu,
3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ,
4nke a bụ iwu dịrị Izrel,
5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef
6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha;
7Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu,
8“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị,
9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu;
10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
11“Ma ndị m ekweghị ige m ntị.
12Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha,
13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị,
14Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha.
15Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ.
16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ;
A Rebuke Against Unjust Judges
1Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;
2Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?
3Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;
4Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;
5Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.
6“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”
7Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;
8O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,