Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya?
繁
Copywork
Igbo BIUO Romans 7장
聖經抄寫不是快速結束的輸入訓練,而是一節一節重新持守經文句子與脈絡的時間。輸入內容會暫存於此瀏覽器,登入後也會儲存至帳號。
以小標題為單位進行 · Romans
Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.
A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ.
Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.
Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.
Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.
Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.
Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị.
Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute.
Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ.
Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m.
Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.
Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.
O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.
Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.
O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime.
Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.
Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.
Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị!