scripture.how Bible Copywork
EN

Copywork

Igbo BIUO 2 Peter 1장

Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.

KO Korean
ZH Chinese
JA Japanese
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persian
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indonesian
TSI
PT Portuguese
VI Vietnamese
AR Arabic
AVD
RU Russian
UK Ukrainian
RO Romanian
BTF
IT Italian
FI Finnish
TO Tongan
HR Croatian
SR Serbian
TR Turkish
HU Hungarian
PL Polish
SK Slovak
LA Latin
NL Dutch
CS Czech
FR French
ES Spanish
DE German
ETC Other languages
1:1
Waiting

Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst,

1:2
Waiting

Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.

1:3
Waiting

O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.

1:4
Waiting

O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.

1:5
Waiting

Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,

1:6
Waiting

tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.

1:7
Waiting

Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.

1:8
Waiting

Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

1:9
Waiting

Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.

1:10
Waiting

Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.

1:11
Waiting

Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.

1:12
Waiting

Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.

1:13
Waiting

Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.

1:14
Waiting

Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.

1:15
Waiting

Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.

1:16
Waiting

Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.

1:17
Waiting

Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”

1:18
Waiting

Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.

1:19
Waiting

Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.

1:20
Waiting

Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.

1:21
Waiting

Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.