Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.
KO
Copywork
Igbo BIUO 전도서 1장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 전도서
Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu
Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile
Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,
Anyanwụ na-awa, na-adakwa,
Ifufe na-efe gaa na ndịda;
Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
Anaghị echeta ndị mgbe ochie,
Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.
Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.
Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”
Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,