scripture.how Bible Copywork
EN

Copywork

Igbo BIUO 1 Thessalonians 3장

Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.

KO Korean
ZH Chinese
JA Japanese
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persian
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indonesian
TSI
PT Portuguese
VI Vietnamese
AR Arabic
AVD
RU Russian
UK Ukrainian
RO Romanian
BTF
IT Italian
FI Finnish
TO Tongan
HR Croatian
SR Serbian
TR Turkish
HU Hungarian
PL Polish
SK Slovak
LA Latin
NL Dutch
CS Czech
FR French
ES Spanish
DE German
ETC Other languages
3:1
Waiting

Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens.

3:2
Waiting

Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu.

3:3
Waiting

Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị.

3:4
Waiting

Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara.

3:5
Waiting

Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi.

3:6
Waiting

Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya.

3:7
Waiting

Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.

3:8
Waiting

Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.

3:9
Waiting

Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.

3:10
Waiting

Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.

3:11
Waiting

Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu.

3:12
Waiting

Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.

3:13
Waiting

Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.