scripture.how Bible Copywork
EN

Copywork

Igbo BIUO 2 Thessalonians 3장

Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.

KO Korean
ZH Chinese
JA Japanese
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persian
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indonesian
TSI
PT Portuguese
VI Vietnamese
AR Arabic
AVD
RU Russian
UK Ukrainian
RO Romanian
BTF
IT Italian
FI Finnish
TO Tongan
HR Croatian
SR Serbian
TR Turkish
HU Hungarian
PL Polish
SK Slovak
LA Latin
NL Dutch
CS Czech
FR French
ES Spanish
DE German
ETC Other languages
3:1
Waiting

Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.

3:2
Waiting

Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.

3:3
Waiting

Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.

3:4
Waiting

Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu.

3:5
Waiting

Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.

3:6
Waiting

Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.

3:7
Waiting

Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.

3:8
Waiting

O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.

3:9
Waiting

Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.

3:10
Waiting

Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”

3:11
Waiting

Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.

3:12
Waiting

Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.

3:13
Waiting

Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.

3:14
Waiting

Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.

3:15
Waiting

Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.

3:16
Waiting

Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.

3:17
Waiting

Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe.

3:18
Waiting

Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.