scripture.how 성경필사
KO

Copywork

Igbo BIUO 에스라 2장

성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.

KO 한국어
ZH 중국어
JA 일본어
HI 힌디어
BN 벵골어
TA 타밀어
TE 텔루구어
ML 말라얄람어
FA 페르시아어
MY 버마어
NE 네팔어
MR 마라티어
KN 칸나다어
HA 하우사어
YO 요루바어
SW 스와힐리어
IG 이그보어
ID 인도네시아어
TSI
PT 포르투갈어
VI 베트남어
AR 아랍어
AVD
RU 러시아어
UK 우크라이나어
RO 루마니아어
BTF
IT 이탈리아어
FI 핀란드어
TO 통가어
HR 크로아티아어
SR 세르비아어
TR 튀르키예어
HU 헝가리어
PL 폴란드어
SK 슬로바키아어
LA 라틴어
NL 네덜란드어
CS 체코어
FR 프랑스어
ES 스페인어
DE 독일어
ETC 기타 언어

소제목 단위로 진행 · 에스라

2:1
대기

Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.

2:2
대기

Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana.

2:3
대기

Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172).

2:4
대기

Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372).

2:5
대기

Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise (775).

2:6
대기

Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ (2,812).

2:7
대기

Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).

2:8
대기

Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise (945).

2:9
대기

Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii (760).

2:10
대기

Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ (642).

2:11
대기

Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ (623).

2:12
대기

Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1,222).

2:13
대기

Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii (666).

2:14
대기

Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii (2,056).

2:15
대기

Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ (454).

2:16
대기

Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ (98).

2:17
대기

Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ (323).

2:18
대기

Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ (112).

2:19
대기

Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).

2:20
대기

Ụmụ Giba, iri itoolu na ise (95).

2:21
대기

Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ (123).

2:22
대기

Ndị ikom Netofa, iri ise na isii (56).

2:23
대기

Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128).

2:24
대기

Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ (42).

2:25
대기

Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743).

2:26
대기

Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621).

2:27
대기

Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122).

2:28
대기

Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).

2:29
대기

Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ (52).

2:30
대기

Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii (156).

2:31
대기

Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).

2:32
대기

Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ (320).

2:33
대기

Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise (725).

2:34
대기

Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345).

2:35
대기

Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ (3,630).

2:36
대기

Ndị nchụaja:

2:37
대기

ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ (1,052)

2:38
대기

ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247)

2:39
대기

ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa (1,107).

2:40
대기

Ndị Livayị:

2:41
대기

Ndị ọbụ abụ:

2:42
대기

Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:

2:43
대기

Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ:

2:44
대기

Keros, Siaha, Padon,

2:45
대기

Lebana, Hagaba, Akub,

2:46
대기

Hagab, Shalmai, Hanan,

2:47
대기

Gidel, Gaha, Reaya,

2:48
대기

Rezin, Nekoda, Gazam,

2:49
대기

Ụza, Pasea Besai,

2:50
대기

Asna, Meunim, Nefusim,

2:51
대기

Bakbuk, Hakufa, Hahua,

2:52
대기

Bazlut, Mehida, Hasha,

2:53
대기

Bakos, Sisera, Tema,

2:54
대기

Nezaya na Hatifa.

2:55
대기

Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi,

2:56
대기

Jaala, Dakon, Gidel

2:57
대기

Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.

2:58
대기

Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).

2:59
대기

Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.

2:60
대기

Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652).

2:61
대기

Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:

2:62
대기

Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.

2:63
대기

Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

2:64
대기

Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360),

2:65
대기

nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ (200).

2:66
대기

Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245).

2:67
대기

Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720).

2:68
대기

Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.

2:69
대기

Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000), maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000) na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100).

2:70
대기

Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.