“Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya,
KO
Copywork
Igbo BIUO · 7:9-19 Joseph and the Ancestors in Egypt
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 사도행전
zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
“Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.
Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt.
Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.
Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.
Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.
E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.
“Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu,
ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.
O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.