Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
KO
Copywork
Igbo BIUO · 26:69-75 Peter Denies Jesus
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 마태복음
Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.”
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.