Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria.
KO
Copywork
Igbo BIUO · 16:1-16 Greetings and Commendation of Fellow Workers
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 로마서
Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.
Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha.
Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.
Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst.
Keleerenụ m Herodian onye ikwu m.
Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.
Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.
Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ.
Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.
Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu.