Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.
KO
Copywork
Igbo BIUO · 11:1-10 The Remnant of Israel Preserved by Grace
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 로마서
Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?
“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”
Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya.
Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.
Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.
Dịka e dere ya,
Devid kwukwara,
Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ.