Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo Devid. Ma nʼihi na ihe banyere Devid masịrị Jonatan,
KO
Copywork
Igbo BIUO 사무엘상 19장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 사무엘상
ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ.
Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.”
Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu.
Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?”
Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”
Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.
Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.
Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara,
Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ.
Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.”
Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo Devid, ebe o si gbapụ.
Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.
Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.”
Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.”
Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?”
Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,”
ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma.
Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ.
Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?”
Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt.
O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”