Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
KO
Copywork
Igbo BIUO 사무엘상 31장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 사무엘상
Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.
Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.”
Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.
Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.
Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan.
Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.
Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.