scripture.how 聖書写経
JA

Copywork

Igbo BIUO 2 Samuel 13장

写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。

KO 韓国語
ZH 中国語
JA 日本語
HI ヒンディー語
BN ベンガル語
TA タミル語
TE テルグ語
ML マラヤーラム語
FA ペルシア語
MY ビルマ語
NE ネパール語
MR マラーティー語
KN カンナダ語
HA ハウサ語
YO ヨルバ語
SW スワヒリ語
IG イボ語
ID インドネシア語
TSI
PT ポルトガル語
VI ベトナム語
AR アラビア語
AVD
RU ロシア語
UK ウクライナ語
RO ルーマニア語
BTF
IT イタリア語
FI フィンランド語
TO トンガ語
HR クロアチア語
SR セルビア語
TR トルコ語
HU ハンガリー語
PL ポーランド語
SK スロバキア語
LA ラテン語
NL オランダ語
CS チェコ語
FR フランス語
ES スペイン語
DE ドイツ語
ETC その他の言語

小見出し単位で進める · 2 Samuel

1:1-16 David Hears of Saul's Death 1:17-27 David's Lament for Saul and Jonathan 2:1-7 David Anointed King of Judah 2:8-11 Ish-bosheth Made King of Israel 2:12-32 The Battle at the Pool of Gibeon and the Death of Asahel 3:1-5 The Long War Between the Houses of David and Saul 3:6-21 Abner Goes Over to David 3:22-30 Joab Kills Abner 3:31-39 David Mourns the Death of Abner 4:1-8 Ish-bosheth Is Murdered 4:9-12 David Executes the Murderers 5:1-5 David Made King of All Israel 5:6-16 Jerusalem Captured as the City of David 5:17-25 David Defeats the Philistines Twice 6:1-11 Uzzah Dies While Moving the Ark 6:12-23 David Dances as the Ark Enters Jerusalem 7:1-17 God Forbids the Temple but Promises a House 7:18-29 David's Prayer in Response to the Covenant 8:1-18 David's Conquests and Reign 9:1-13 David Shows Kindness to Mephibosheth 10:1-19 The War Against the Ammonites and Arameans 11:1-13 David Sins with Bathsheba 11:14-27 Uriah Sent to His Death 12:1-14 Nathan's Rebuke and David's Repentance 12:15-25 The Death of the Child and the Birth of Solomon 12:26-31 The Capture of Rabbah 13:1-22 Amnon Violates Tamar 13:23-39 Absalom Kills Amnon and Flees 14:1-20 Joab Sends the Woman of Tekoa 14:21-33 Absalom Returns to Jerusalem 15:1-12 Absalom Steals the People's Hearts and Rebels 15:13-37 David Flees from Jerusalem 16:1-14 David Meets Ziba and Shimei 16:15-23 Ahithophel's Counsel and Absalom's Deeds 17:1-14 Hushai Defeats Ahithophel's Counsel 17:15-29 Warning Brought to David and His Escape 18:1-18 Absalom's Army Is Defeated 18:19-33 David Is Told of Absalom's Death 19:1-8 Joab Rebukes David's Grief 19:9-30 David Returns to Jerusalem 19:31-43 Farewell to Barzillai and Strife Among the Tribes 20:1-13 The Rebellion of Sheba 20:14-26 The End of Sheba and David's Officials 21:1-14 Famine and the Gibeonites' Revenge 21:15-22 Battles with the Philistine Giants 22:1-51 David's Song of Thanksgiving 23:1-7 The Last Words of David 23:8-39 David's Mighty Men 24:1-17 David's Census and Its Punishment 24:18-25 David Builds an Altar at the Threshing Floor of Araunah
13:1
待機

Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.

13:2
待機

Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

13:3
待機

Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

13:4
待機

Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?”

13:5
待機

Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ”

13:6
待機

Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”

13:7
待機

Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.

13:8
待機

Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.

13:9
待機

Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya.

13:10
待機

Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.

13:11
待機

Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.”

13:12
待機

Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a.

13:13
待機

Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”

13:14
待機

Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

13:15
待機

Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”

13:16
待機

Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.”

13:17
待機

Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”

13:18
待機

Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.

13:19
待機

Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.

13:20
待機

Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.

13:21
待機

Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu.

13:22
待機

Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.

13:23
待機

Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.

13:24
待機

Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”

13:25
待機

Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.

13:26
待機

Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?”

13:27
待機

Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa.

13:28
待機

Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”

13:29
待機

Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga.

13:30
待機

Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”

13:31
待機

Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.

13:32
待機

Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.

13:33
待機

Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.”

13:34
待機

Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga.

13:35
待機

Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.”

13:36
待機

Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.

13:37
待機

Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn.

13:38
待機

Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ.

13:39
待機

Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.