Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn,
EN
Copywork
Igbo BIUO Amos 6장
Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.
Practice by section · Amos
Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya,
Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ
Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi,
Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara,
Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;
Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị,
Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.
Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.
Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?
Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba,
“Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,”