scripture.how Bible Copywork
EN

Copywork

Igbo BIUO Esther 5장

Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.

KO Korean
ZH Chinese
JA Japanese
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persian
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indonesian
TSI
PT Portuguese
VI Vietnamese
AR Arabic
AVD
RU Russian
UK Ukrainian
RO Romanian
BTF
IT Italian
FI Finnish
TO Tongan
HR Croatian
SR Serbian
TR Turkish
HU Hungarian
PL Polish
SK Slovak
LA Latin
NL Dutch
CS Czech
FR French
ES Spanish
DE German
ETC Other languages
5:1
Waiting

Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ.

5:2
Waiting

Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.

5:3
Waiting

Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”

5:4
Waiting

Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”

5:5
Waiting

Eze tụgharịrị gwa ndị ozi ya sị, “Gwanụ Heman ka o mee ngwangwa bịa ka anyị gaa mee ihe Esta rịọrọ.”

5:6
Waiting

Mgbe ha na-aṅụ mmanya, eze sịrị Esta, “Ugbu a, gwa m ihe ị chọrọ, aga m enye gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ otu ọkara alaeze m.”

5:7
Waiting

Esta zara sị, “Arịrịọ m na mkpa m bụ nke a,

5:8
Waiting

ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.”

5:9
Waiting

Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.

5:10
Waiting

Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya.

5:11
Waiting

ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.

5:12
Waiting

Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.

5:13
Waiting

Ma ihe ndị a niile bụ ihe efu mgbe ọbụla m na-ahụ Mọdekai onye Juu ahụ ka ọ na-anọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze.”

5:14
Waiting

Mgbe ahụ, Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile, dụrụ ya ọdụ sị ya, “Ihe ị ga-eme bụ nke a: Kwadoo osisi e ji akwụgbu mmadụ, nke ịdị elu ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Nʼụtụtụ echi, rịọ eze ka o nye gị ike ịkwụgbu Mọdekai nʼelu ya. Mgbe e mere nke a, ọṅụ gị ga-ezukwa oke, mgbe ị ga-esorokwa eze gaa rie oriri a kpọrọ unu.” Okwu a masịrị Heman nke ukwuu. O nyere iwu ka a kwadoo osisi ahụ ngwangwa.