Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.
EN
Copywork
Igbo BIUO Numbers 24장
Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.
Practice by section · Numbers
Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
O buru amụma ndị a sị,
Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:
amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,
“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,
A ga-emeri Edọm,
Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.
Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:
Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:
Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,
Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:
Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.
Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.