scripture.how Bible Copywork
EN

Copywork

Igbo BIUO Ruth 4장

Copywork is not a speed-typing drill but time to re-hold the words and flow of Scripture, one verse at a time. Your input is saved temporarily in this browser, and to your account when you are signed in.

KO Korean
ZH Chinese
JA Japanese
HI Hindi
BN Bengali
TA Tamil
TE Telugu
ML Malayalam
FA Persian
MY Burmese
NE Nepali
MR Marathi
KN Kannada
HA Hausa
YO Yoruba
SW Swahili
IG Igbo
ID Indonesian
TSI
PT Portuguese
VI Vietnamese
AR Arabic
AVD
RU Russian
UK Ukrainian
RO Romanian
BTF
IT Italian
FI Finnish
TO Tongan
HR Croatian
SR Serbian
TR Turkish
HU Hungarian
PL Polish
SK Slovak
LA Latin
NL Dutch
CS Czech
FR French
ES Spanish
DE German
ETC Other languages
4:1
Waiting

Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.

4:2
Waiting

Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ.

4:3
Waiting

Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.

4:4
Waiting

Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.”

4:5
Waiting

Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”

4:6
Waiting

Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.”

4:7
Waiting

Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.

4:8
Waiting

Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya.

4:9
Waiting

Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.

4:10
Waiting

Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.”

4:11
Waiting

Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.

4:12
Waiting

Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”

4:13
Waiting

Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.

4:14
Waiting

Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.

4:15
Waiting

Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”

4:16
Waiting

Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.

4:17
Waiting

Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.

4:18
Waiting

Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez.

4:19
Waiting

Hezrọn mụrụ Ram

4:20
Waiting

Aminadab mụrụ Nashọn

4:21
Waiting

Salmọn mụrụ Boaz

4:22
Waiting

Obed mụrụ Jesi