Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu.
KO
Copywork
Igbo BIUO 역대상 13장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 역대상
Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.
Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.”
Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.
Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim.
Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Onyenwe anyị, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim, igbe ahụ nke akpọkwasịrị aha ya.
Ha ji ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ buru igbe ọgbụgba ndụ Chineke site nʼụlọ Abinadab, Ụza na Ahio na-eduzi ụgbọala ahụ ụzọ.
Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.
Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.
Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
O bubataghị igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
Igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ nọrọ nʼezinaụlọ Obed-Edọm nʼụlọ ya ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere.