Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha:
KO
Copywork
Igbo BIUO 역대상 24장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 역대상
Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
Nza nke mbụ mara Jehoiarib
nke atọ, Harim
nke ise, Malkija
nke asaa, Hakoz
nke itoolu, Jeshua
nke iri na otu, Eliashib
nke iri na atọ, Hupa
nke iri na ise, Bilga
nke iri na asaa, Hezia
nke iri na itoolu, Petahaya
nke iri abụọ na otu, Jakin
nke iri abụọ na atọ, Delaya
Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị:
Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot.
Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara
A họpụtara Maịka nwa Uziel,
A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya,
Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi.
Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a:
Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot.
Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.