Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
KO
Copywork
Igbo BIUO 사무엘하 22장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 사무엘하
Ọ sịrị:
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
O kewara mbara eluigwe, rịdata;
Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
E kpughere ala ala nke oke osimiri.
“O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;
Iwu ya niile dị nʼihu m,
Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.
“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.
Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.
Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
Obi na-ada ha mba.
“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.