Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra.
JA
Copywork
Igbo BIUO Zechariah 4장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Zechariah
Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?”
Ahụkwara m osisi oliv abụọ nke dị nʼakụkụ ihe ịdọba oriọna ahụ. Otu dị nʼotu akụkụ ya, nke ọzọ, nʼakụkụ nke ọzọ.”
A sịrị m mmụọ ozi ahụ na-ekwuru m okwu, “Nna m ukwu, gịnị ka nke a pụtara?”
Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sịrị m, “Ị na-ekwu na ị maghị ihe ha bụ?”
Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
“Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ”
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị sị,
“Zerubabel wara ntọala ụlọnsọ ukwu a, ọ bụ ya ga-ewuchakwa ya. Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu.
“Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?”
Mgbe ahụ, a sịrị m ya, “Gịnị bụ osisi oliv abụọ ahụ dị nʼaka nri na nʼaka ekpe ihe ịdọba oriọna ahụ?”
A sịkwara m ya nke ugboro abụọ, “Gịnị bụ alaka osisi oliv abụọ ndị a dị nʼakụkụ okporo ọlaedo abụọ ahụ, nke e si na ha na-awụpụta mmanụ ọlaedo?”
Ọ sịrị m, “Ọ pụtara na ị maghị ihe ha bụ?”
Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ndị a bụ mmadụ abụọ a họpụtara tee mmanụ, ife ya ofufe bụ Onyenwe ụwa niile.”