Okwu Amụma.
JA
Copywork
Igbo BIUO Zechariah 9장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Zechariah
Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!
Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,
Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,
Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.
Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.
Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,
Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!