Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;
KO
Copywork
Igbo BIUO 이사야 10장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 이사야
iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha
Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?
Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,
“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.
Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,
Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?
Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,
Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị
Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
Nʼihi na ọ na-asị,
Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,
A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,
Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,
Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe
Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe
Ha erutela Ayịat;
Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara;
Tienụ mkpu akwa unu ada Galim,
Lee na Madmena nọ nʼọsọ,
Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa;
Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa.