“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,”
KO
Copywork
Igbo BIUO 이사야 30장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 이사야
Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka
Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere,
Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan
ihere ga-eme onye ọbụla
Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.
bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.
Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,
Unu na-anọchiri anyị ụzọ,
Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,
mmehie a ga-aghọrọ unu
Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
Otu onye nʼime ndị iro unu
Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”
Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.
Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.
Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.
Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!
Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,
Ma unu ga-abụ abụ
Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,
Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu;
Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya,
Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga.