Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
KO
Copywork
Igbo BIUO 이사야 13장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 이사야
Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.
Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;
Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya
Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.