Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị
JA
Copywork
Igbo BIUO Proverbs 11장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Proverbs
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,
Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;
Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;
Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,
Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;
Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,
Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,
Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.
Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,
A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,
Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,
Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,
Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,
Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;
Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị
Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,
Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,
E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;
Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,
Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,
Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,
Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,
Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,
Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;