Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?
JA
Copywork
Igbo BIUO Proverbs 8장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Proverbs
Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,
Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile
ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;
Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;
Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;
Ọnụ m na-ekwu eziokwu
Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.
Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;
Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha
Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.
“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.
Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;
Site na m ka ndị eze ji achị,
Site na m ka ndị eze ji achị
Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.
Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,
Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,
Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,
Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.
“Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,
Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;
Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,
tupu e kee ugwu ukwu
E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa
Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,
mgbe o hiwere mbara eluigwe,
mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,
Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.
Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,
“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;
Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,
Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,
nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;
Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;