Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,
JA
Copywork
Igbo BIUO Proverbs 4장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Proverbs
Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,
ọ ziri m ihe, sịkwa m,
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,
Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.
Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma
Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;
M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,
Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,
Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,
Emela dịka ndị na-emebi iwu.
Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;
nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.
Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,
Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,
Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,
Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.
Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;
nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,
Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,
Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;
Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;
Leruo ije ụkwụ gị anya,
Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;