“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,
KO
Copywork
Igbo BIUO 욥기 13장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 욥기
Mụ onwe m makwa ihe unu maara;
Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,
Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;
Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,
Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;
Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?
Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?
Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?
Ọ ghaghị ịbara unu mba
Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?
Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;
“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;
Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,
A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.
Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta
Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.
Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,
Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo ?
“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,
Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.
Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.
Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?
Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?
Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?
Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,
Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;
“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,