“Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị?
KO
Copywork
Igbo BIUO 욥기 5장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 욥기
Oke iwe na-egbu onye nzuzu,
Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ,
Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị,
Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi;
Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta,
Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,
“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;
Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,
Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,
Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,
Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,
Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,
Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,
Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,
Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,
“Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị;
Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;
Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,
Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;
Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.
Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,
Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,
Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;
Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,
Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,
“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.