“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;
KO
Copywork
Igbo BIUO 욥기 33장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 욥기
Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;
Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;
Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,
Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;
Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;
Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,
“Ma ị kwuola ya na ntị m,
‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;
Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;
Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;
“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,
Gịnị mere i ji na-ekpesara ya
Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,
Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,
O nwere ike kwunye ha okwu na ntị
ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,
ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,
“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,
Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,
Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,
Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,
ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,
Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,
Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:
ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,
“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ
Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,
“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;
Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;
Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;