“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan
JA
Copywork
Igbo BIUO Job 41장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Job
Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya
Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?
Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ
Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?
Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?
Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya
Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,
Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.
Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.
Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?
“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,
Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?
Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,
Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro
nke ọbụla dị ibe ya nso,
E jikọtara ha ọnụ nke ọma,
Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;
Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,
Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,
Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.
Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,
Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,
Obi ya dị ike dịka nkume,
Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;
O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,
Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;
Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,
Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,
Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,
Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;
Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;
O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,
Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.