Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
JA
Copywork
Igbo BIUO Job 4장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Job
“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?
Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,
Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,
Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;
Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,
“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?
Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka
Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.
Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,
Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,
“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,
Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,
oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,
Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.
Ọ kwụsịrị;
‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:
Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,