Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 104장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;
na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.
O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,
Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;
I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,
Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,
Ha sitere nʼelu ugwu niile,
Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,
Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,
Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ
Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;
Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;
Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,
Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;
Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;
I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;
Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;
Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,
Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,
Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,
Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.
Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;
Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,
Ha niile na-adabere na gị,
Ị na-enye ha nri;
Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,
Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;
onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;
Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,
Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.