Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 10장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,
Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,
Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.
Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,
Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,