O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 9장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
Ndị iro m na-alaghachi azụ,
I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;
O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;