Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi;
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 89장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.
‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi
O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,
Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?
Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;
O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;
Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,
Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;
Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,
Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,
I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,
Achọtala m Devid ohu m,
Aka m ga-agba ya ume;
Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;
Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.
Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,
M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,
Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,
Aga m eme ya nwa mbụ m,
Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,
Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,
“Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,
ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,
aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,
ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.
Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.
Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie
na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.
Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,
Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara
Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,
Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.
I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;
I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,
I meela ka ịma mma ya gwụsịa.
I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.
Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị?
Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.
Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,
O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,
Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,
O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,
Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.