Onyenwe anyị, biko kpepụta m,
Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,
Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.
Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
Ana m abụkwa abụ ekele,
O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,
ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,
Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;
Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;