O Chineke, nụrụ ekpere m,
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 55장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
ṅaa m ntị, zaakwa m.
nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,
Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;
Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;
Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!
Agaara m efelaga ebe dị anya,
Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,
O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,
Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;
A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;
A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,
Maọbụ gị, nwoke dịka m,
onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,
Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;
Ma akpọkuru m Chineke,
Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,
Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,
Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,
Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta,
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume