Toonu Onyenwe anyị.
Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;
Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;
Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,
Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,
Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;
Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;
Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;
Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,
Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,