O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
KO
Copywork
Igbo BIUO 시편 18장
성경필사는 빠르게 끝내는 입력 훈련이 아니라, 한 절씩 말씀의 문장과 흐름을 다시 붙드는 시간입니다. 입력 내용은 이 브라우저에 임시 저장되며, 로그인하면 계정에도 저장됩니다.
소제목 단위로 진행 · 시편
Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,
Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;
Ụdọ nke ili kere m gburugburu,
Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
O kewara mbara eluigwe, rịdata;
Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;
Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,
E kpughere ala ala nke oke osimiri,
O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,
Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;
Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
Iwu ya niile dị nʼihu m,
Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;
Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,
Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;
Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.
Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,
I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;
Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ
Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
Obi na-ada ha mba;
Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!
Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,
onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,
Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;