Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
JA
Copywork
Igbo BIUO Isaiah 38장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Isaiah
Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,
“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,
“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.
Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.
Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa
Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ
Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
Onyenwe anyị ga-azọpụta m,
Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”