Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ.
JA
Copywork
Igbo BIUO Isaiah 4장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Isaiah
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi.
Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem.
Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.
Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.