Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?
JA
Copywork
Igbo BIUO Psalms 22장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Psalms
O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,
Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;
Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;
Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;
Abụ m idide, abụghị m mmadụ;
Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;
“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;
Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.
Anọla m ebe dị anya,
Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;
Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa
A wụpụla m dịka mmiri,
Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;
A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;
Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,
Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;
Napụta ndụ m site na mma agha,
Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,
Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;
Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;
Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya
Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;
Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,
Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,
Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,
Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;
Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;
Ha ga-ekwusa ezi omume ya