Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
JA
Copywork
Igbo BIUO Psalms 33장
写経は速く終える入力練習ではなく、一節ずつみ言葉の文と流れを改めて受け止める時間です。入力内容はこのブラウザに一時保存され、ログインするとアカウントにも保存されます。
小見出し単位で進める · Psalms
Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,
Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;
Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;
Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;
Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;
Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.
O sitere nʼebe obibi ya na-ele
Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,