Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m
Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m,
Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m;
Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ;
Ndị mpako agaghị eguzo
Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
Maa ha ikpe, Chineke.
Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.